Job 10

1“Ike ịdị ndụ agwụla m.
Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi,
kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.
2Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe,
kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe.
3Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m,
si otu a leda ọrụ aka gị anya,
mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?
4Ị nwere anya nke anụ ahụ?
Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ?
5Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ,
ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?
6Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m
ma nyochaa mmehie m?
7Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m,
na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị.

8“Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m.
Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m?
9Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ.
Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ?
10Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi
mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ?
11Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ,
werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe?
12I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị,
nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.

13“Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị,
amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.
14Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya,
ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.
15Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!
A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu
nʼihi na ejupụtara m nʼihere,
bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m.
16Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ
ma werekwa ike gị dị egwu megide m.
17I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m,
mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ;
ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.

18“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m?
Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.
19A sịkwarị na amụpụtaghị m
maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!
20Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole?
Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,
21tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ
ebe m na-agaghị esi pụtakwa.
22Nʼala nke oke ọchịchịrị,
ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị,
ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”
Copyright information for IboBIU